Ecclesiastes 2

Ịgbaso ihe na-enye aṅụrị enweghị isi

1Echere m nʼime obi m sị, Ugbu a, aga m eji ihe na-enye obi aṅụrị nwaa gị site otu a chọpụta ihe dị mma, ma nke a bụkwa ihe efu. 2“Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?” 3Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.

4Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị. 5Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha, 6wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri. 7Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem. 8Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ. 9E, aghọrọ m onye dị ukwuu karịa eze niile ndị burula m ụzọ chịa na Jerusalem. Ma nʼime ihe ndị a niile, anya doro m, ihe niile ka m ji amamihe tulee.

10Ihe ọbụla m chọrọ, ka m na-ewere;
egbochighị m onwe m aṅụrị ọbụla.
Obi m ṅụrịrị ọṅụ site nʼọrụ niile,
nke a bụkwa oke m ketara na ndọgbu niile m dọgburu onwe m.
11Mgbe m tulere ihe banyere ihe ndị a niile m tinyetụrụ aka,
otu m si dọgbuo onwe m nʼọrụ banyere ha,
mkpebi m bụ na ha niile bụ ihe efu, dịka ịchọ ijide ifufe.
Nʼezie, ihe niile bụ ihe efu, ha abakwaghị uru.

Amamihe na nzuzu enweghị isi

12Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe,
na ịyị ara na nzuzu.
Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme,
karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?
13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu,
dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ
ma isi kpuru onye nzuzu.
Ma achọpụtakwara m
na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
15Agwara m onwe m okwu sị,

“Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ.
Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?”
Ekwuru m nʼobi m sị,
“Ihe a bụkwa ihe efu.
16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu.
Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha.
Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”

Ndọgbu nʼọrụ abaghị uru

17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe. 18Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m. 19Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu. 20Ya mere, o wutere m nʼobi na m dọgburu onwe m nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ. 21Nʼihi na mmadụ nwere ike jiri amamihe, na ihe ọmụma na ǹka dọgbuo onwe ya nʼọrụ, emesịa, ha ahapụrụ onye na-enweghị mgbe ọ rụrụ ọrụ ọbụla ihe ndị ahụ niile. Nke a bụkwa ihe efu, na oke ihe ndakwasị. 22Gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ? 23Nʼihi nʼụbọchị ha niile jupụtara naanị nʼihe mgbu na iru ụjụ, ọ bụladị nʼabalị, obi ha anaghị ezu ike. Ihe ndị a bụkwa ihe efu.

24Nʼihi ya, ekpebiri m na ọ dịghị ihe ọzọ ga-abara mmadụ uru karịakwa naanị ịnọdụ ala rie nri, ṅụọkwa ihe ma chọta ojuju afọ nʼọrụ ya. Achọpụtakwara m na ọ bụladị nke a si nʼaka Chineke. 25Ọ dịghị onye pụrụ iri maọbụ ṅụọ ma o siteghị na Chineke? 26Nʼihi na ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ, ka Chineke na-enye amamihe na ihe ọmụma, na ọṅụ; ma ọ na-enye onye mmehie ọrụ ịkpakọta na ịchịkọba akụnụba nke ọ ga-enyefe nʼaka onye ahụ ihe ya dị Chineke mma. Nke a bụkwa ihe efu; ịchụso ifufe.

Copyright information for IboBIU